Adaugo bụ nwata nwanyị nwere ọnọdụ pụrụ iche. Ihe na eme ya bụ ịhe ndị mmadụ aghọtayị maka na ọ bụghị ịhe enwere ike ịkọwara mmadụ. Nzọputa Adaugo sitere mgbe Ikem, bu nwa ọgbenye, rọro nrọ otu abalị. Nne ya nwụrụ anwụ biakwutere ya na nrọ gwakwa ya ịhe ọ ga eme were zọputa Adaugo. Nke a bụ akụkọ eji amụ ta ịhe. Enenịkwana mmadụ ibe gị n'ime ọnọdụ ọbụla ma ọ dị njọ ma ọ dị mma. Ndụ mmadụ dị n'aka Ọbasi bi n'elụ. Ọ nwekwara ike itụghari ya k'ọsi masi ya.